Psalms 147

Onyenwe anyị dike, na onye amara

1Toonu Onyenwe anyị!

Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto.
Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!

2 Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem:
ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ.
3Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa
na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
4Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile
na-akpọkwa ha nʼotu na otu. a
5Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu;
nghọta ya enweghị nsọtụ.
6 Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume
ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.

7Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ;
jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.

8Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe;
ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo
na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.
9Ọ na-enye ehi niile nri
na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.

10Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya,
maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ.
11 Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.

12O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma;
o Zayọn, too Chineke gị.

13Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike,
na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.
14Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo,
jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ.

15Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile;
okwu ya na-agbasa ngwangwa.
16Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ,
na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.
17Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute.
Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?
18Ọ na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha;
ọ na-akpalịte ikuku ya mee ka mmiri bido ịsọgharị.

19O kpugheela okwu ya nye Jekọb,
iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel.
20O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a.
Ha amakwaghị iwu ya niile.

Toonu Onyenwe anyị!
Copyright information for IboBIU